Nyefee Akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụzọ Dị Irè
1 Jisọs nwere nkà n’otú o si amalite okwu. Ọ maara ihe ọ ga-ekwu iji kpalie mmasị. N’otu oge ọ malitere mkparịta ụka nke ya na otu nwanyị onye Sameria nanị site n’ịrịọ ya mmiri ọṅụṅụ. Nke a dọọrọ mmasị ya ozugbo n’ihi na “ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe.” Mkparịta ụka sochirinụ mesịrị nyere ya na ọtụtụ ndị ọzọ aka ịghọ ndị kwere ekwe. (Jọn 4:7-9, 41) Anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya ya.
2 Mgbe ị na-akwadebe inyefe akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi, jụọ onwe gị, ‘Gịnị bụ ihe ndị na-echegbu ndị mmadụ nọ n’ókèala anyị ugbu a? Gịnị ga-amasị onye nọ n’afọ iri na ụma, onye katatụrụ ahụ, di, ma ọ bụ nwunye?’ Ị pụrụ ikwadebe ihe karịrị otu okwu mmeghe ma hazie iji nke yiri ka ọ kasị daba adaba n’ọnọdụ ahụ mee ihe.
3 Ebe ndakpọ nke ndụ ezinụlọ na-echegbu ọtụtụ ndị, ị pụrụ ikwu, sị:
■ “Nrụgide nke ndụ kwa ụbọchị akpataworo ezinụlọ dị iche iche taa oké ndọlị. Olee ebe ha pụrụ ịchọta enyemaka? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible pụrụ ịbụrụ anyị ezi ihe enyemaka. [Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.] Akwụkwọ Nsọ na-enye ụkpụrụ nduzi bara uru ndị pụrụ inyere ezinụlọ dị iche iche aka ịlanarị. Rịba ama ihe e kwuru na paragraf nke 3 na peji nke 238 nke akwụkwọ a, bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs n’Elu Ala.” Gụpụta paragraf nke 3, ma nyefee akwụkwọ ahụ.
4 Ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe nchegbu banyere nsogbu mpụ na-arị elu. Ị pụrụ iji okwu mmeghe na-esonụ mee ihe:
■ “Anyị na ndị mmadụ na-ekwurịta banyere nchebe onwe onye. E nwere ọtụtụ mpụ gburugburu anyị, ọ na-emetụtakwa ndụ anyị. Gịnị ka i chere ọ ga-ewe iji mee ka ndị mmadụ dị ka mụ na gị nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’okporo ámá n’abalị?” Ị pụrụ ịgụ Abụ Ọma 37:10, 11 ma kọwapụta ngọzi ndị Alaeze Chineke ga-eweta, na-eji peji nke 156-158 nke akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi eme ihe.
5 Ọ bụrụ na i nwere mmasị karị n’ụzọ njekwu ka mfe, ị pụrụ ikwu, sị:
■ “Anyị na-agba ndị agbata obi anyị ume ịtụle ọmarịcha ọdịnihu nke Bible na-eche anyị n’ihu. [Gụọ Mkpughe 21:3, 4.] Nke a ọ̀ dị gị mma? [Nye ohere maka nzaghachi.] Isi 19 nke akwụkwọ a na-eme ka ngọzi ndị ọzọ ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enweta n’okpuru Alaeze Chineke pụta ìhè.” Ọ bụrụ na o nwere mmasị, nyefee akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi.
6 Ịkwadebe okwu mmeghe dị irè pụrụ inyere gị aka iru ndị agụụ ezi omume na-agụ.—Mat. 5:6.