Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Ọgọst 1
“Gịnị ka i chere dị ụmụ mmadụ mkpa iji nwee obi ụtọ? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Matiu 5:3.] Ihe a bụ otu n’ime ihe ndị Jizọs kwuru ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Isiokwu a kọwara ihe anyị ga-amụta n’aka Jizọs gbasara otú e si enweta ezigbo obi ụtọ.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 16.
Teta! Julaị–Septemba
“Gụọ Ilu 17:17. Jụzie onye nwe ụlọ, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ ụdị enyi a a kọwara ebe a, olee otú i nwere ike isi nyere enyi gị na-aṅụ sịga aka ịkwụsị ya? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a kọwara ihe anọ dị mkpa onye na-aṅụ sịga ga-eme, ya enyere ya aka ịkwụsị ịṅụ sịga.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 9.
Ụlọ Nche Septemba 1
Kwuo otu ihe mere n’ókèala unu nke na-eche onye ọ bụla uche. Jụzie onye nwe ụlọ, sị: “Ì chetụla ihe mere ndị mmadụ ji eme ụdị ihe ọjọọ a? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ụdị ihe a ga-emecha kwụsị. [Gụọ 2 Pita 3:13.] Magazin a kọwara ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ya kpatara ihe ọjọọ, kọwaakwa otú Chineke ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile kwụsị n’oge na-adịghị anya.”
Teta! Julaị–Septemba
“E nwere ọtụtụ ihe bara uru e jirila ego mee, ma, ị̀ ma ihe ego na-agaghị emeli? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ekliziastis 7:12.] Ọ bụ eziokwu na ego nwere ike ichebe mmadụ mgbe ụfọdụ, ma, ọ bụ naanị amamihe si na Baịbụl nwere ike ichebe mmadụ n’oge niile.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.