Otú E Nwere Ike Isi Jiri Broshuọ Baịbụl Na-ekwu Duzie Ọmụmụ Baịbụl
Ọtụtụ ndị bi n’ókèala anyị, nke ka nke ndị na-anaghị aga chọọchị, amaghị ihe ọ bụla gbasara Baịbụl. Ihe ụfọdụ ndị nkwusa merela mgbe ha ji akwụkwọ Bible Na-akụzi na-amụrụ ụdị ndị ahụ ihe bụ iji broshuọ Baịbụl Na-ekwu nyere ha aka ịmatatụ ihe ndị dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanna na onye ọ na-amụrụ ihe mụchara isi nke atọ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, nwanna a na onye ọ na-amụrụ ihe tụlere ihe dị ná nkebi nke mbụ na broshuọ ahụ. Ha sizi otú ahụ na-atụle nkebi ndị dị na broshuọ a ma ha mụchaa ihe. È nwere onye na-amaghị ihe gbasara Baịbụl gị na ya na-amụ ihe? Ka i nwee ike inyere ya aka ka ọ mata ‘ihe odide ndị dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ọ mara ihe iji nweta nzọpụta,’ gbalịa hụ na gị na ya na-atụle otu n’ime nkebi ndị dị na broshuọ ahụ mgbe ọ bụla unu mụchara ihe.—2 Tim. 3:15.