Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/09 p. 6
  • Chọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ì Nwere Ókèala nke Aka Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ịchọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 9/09 p. 6

Chọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị

1. Olee otú anyị si egosi na anyị ji ihe ùgwù ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe?

1 Mgbe Jizọs na-ekwusa ozi ọma, ọ gbara ezigbo mbọ zie ndị dị umeala n’obi ozi ọma ga-akasi ha obi. (Aịza. 61:1, 2) Ebe anyị bụ ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst, anyịnwa taa nwere ihe ùgwù iṅomi Kraịst ka anyị na-agba ezigbo mbọ ma jiri nlezianya na-achọpụta ndị kwesịrị ekwesị nọ n’ókèala anyị.—Mat. 10:11; 2 Kọr. 5:20.

2. Olee otú Pọl si gosi na ọ dị mkpa ịga ebe a ga-ahụ ndị mmadụ, gịnịkwa ka nke a rụpụtara?

2 Gaa Ebe A Ga-enweta Ndị Mmadụ: Ebe Pọl onyeozi na-agakarị ekwusara ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ozi ọma bụ n’ụlọ nzukọ ha. (Ọrụ 14:1) Na Filipaị, ya na Saịlas gara chọọ ndị ha ga-ezi ozi ọma ‘n’ebe ha chere na e nwere ebe a na-ekpe ekpere.’ Ha ziri ụmụ nwaanyị gbakọrọ n’ebe ahụ ozi ọma, otu onye n’ime ha bụ́ Lidia nabatakwara eziokwu ahụ n’egbughị oge.—Ọrụ 16:12-15.

3. Olee ebe ndị ọzọ anyị nwere ike ịga kwusaa ozi ọma ma e wezụga ịga ozi ụlọ n’ụlọ?

3 E wezụga ịga ozi ọma ụlọ n’ụlọ, ì nwere ike zie ndị mmadụ ozi ọma n’ọdụ ụgbọala, n’ebe a na-anọ atụrụ ndụ, n’ebe a na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ, n’okporo ámá ndị na-ekwo ekwo, nakwa n’ụlọ ahịa ndị dị n’ókèala unu? I nwedịrị ike isi na telefon ma ọ bụ jiri akwụkwọ ozi zie ndị bi n’ụlọ ndị e nwere ndị nche na ụlọ ndị a na-adịghị ekwekarị ka ndị mmadụ bata ozi ọma. Ọ bụrụ na anya na-eru anyị ala, anyị ana-agakwa n’ebe a ga-enweta ndị mmadụ n’ókèala anyị, anyị ga-enwe ‘ọtụtụ ihe anyị na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 15:58.

4. Olee ohere ndị ọzọ anyị nwere ma ọ bụrụ na ókèala ọgbakọ anyị ebughị ibu?

4 Ọtụtụ ndị nkwusa agafeela ọgbakọ ọzọ dị n’obodo ha ma ọ bụ n’obodo ọzọ iji nwetakwuo ndị ha ga-ekwusara ozi ọma. Ndị ọzọ amụọla asụsụ ọhụrụ iji nwee ike ikwusara ndị si obodo ọzọ kwabata n’obodo ha ozi ọma.

5. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele oge anyị a anya, oleekwa ihe anyị kwesịrị ikpebi ime?

5 Anyị niile kwesịrị iburu n’obi na “ubi ahụ bụ ụwa.” (Mat. 9:37; 13:38) N’ihi otú ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a si jiri ọsọ na-abịa, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ichebara ọnọdụ ya echiche nke ọma, mara ihe ọ ga-emeli, ohere o nwere na otú o nwere ike isi wepụtakwuo oge maka ozi ọma. Jehova na-ekwe anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị ebute ihe ndị metụtara Alaeze ya ụzọ ná ndụ anyị, na ya ga-agọzi mgbalị niile anyị ji ezi obi na-eme iji hụ na anyị tinyekwuru oge n’ije ozi ọma.—Mat. 6:33.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya