Jeremaya
37 Nebukadneza* eze Babịlọn chiri Zedekaya+ nwa Josaya eze ka ọ chịwa Juda.+ N’ihi ya, Zedekaya nọchiri Konaya*+ nwa Jehoyakim malite ịchị. 2 Ma, ya na ndị na-ejere ya ozi na ndị obodo ahụ emeghị ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.
3 Eze Zedekaya wee zie Jehukal+ nwa Shelemaya na Zefanaya+ nwa Measaya onye nchụàjà ka ha gaa gwa Jeremaya onye amụma, sị: “Biko, rịọrọ anyị Jehova bụ́ Chineke anyị arịrịọ.” 4 Jeremaya nọkwa na-aga ebe ọ bụla ọ chọrọ ịga n’obodo ahụ, n’ihi na ha akpọchibeghị ya n’ụlọ mkpọrọ.+ 5 Mgbe ndị Kaldia nọchibidoro Jeruselem ma nụ na ndị agha Fero si Ijipt na-abịa,+ ha laghachiri, hapụzie ịlụso Jeruselem agha.+ 6 N’oge ahụ, Jehova gwara Jeremaya onye amụma, sị: 7 “Mụnwa bụ́ Jehova, bụ́ Chineke Izrel, sịrị, ‘Gakwurunụ eze Juda, onye ziri unu ka unu bịa jụọ m ase, gwakwanụ ya, sị: “Ndị agha Fero, ndị na-abịa inyere unu aka, ga-alaghachi n’obodo ha, bụ́ Ijipt.+ 8 Ndị Kaldia ga-abịaghachi lụso obodo a agha, weghara ya ma gbaa ya ọkụ.”+ 9 Jehova kwukwara, sị: “Unu aghọgbula onwe unu,* na-asị, ‘Ndị Kaldia ga-alarịrị. Ha agaghị alụso anyị agha.’ Unu ekwula otú ahụ n’ihi na ha agaghị ala. 10 Ọ bụrụgodị na unu egbuo ndị agha ndị Kaldia niile na-alụso unu agha, ya abụrụkwa na ndị fọdụrụ n’ime ha bụ naanị ndị e merụrụ ahụ́, ha ga-esikwa n’ụlọikwuu ha pụta gbaa obodo a ọkụ.”’”+
11 Mgbe ndị agha Kaldia hapụrụ Jeruselem n’ihi ndị agha Fero,+ 12 Jeremaya si Jeruselem gawa n’ala Benjamin+ ka e kenye ya ala n’ala ahụ bụ́ ala ndị obodo ha. 13 Ma, mgbe o ruru n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin, onyeisi ndị na-eche nche ebe ahụ jichiri ya. Aha ya bụ Iraịja. Ọ bụ nwa Shelemaya nwa Hananaya. Ọ gwakwara Jeremaya onye amụma, sị: “Ị chọrọ ịgbakwuru ndị Kaldia.” 14 Ma Jeremaya sịrị: “Ọ bụghị eziokwu. Anaghị m agbakwuru ndị Kaldia.” Ma, Iraịja egeghị ya ntị. Kama, ọ kpụụrụ Jeremaya kpụgara ndị isi. 15 Ndị isi ahụ wesokwara Jeremaya iwe,+ tie ya ihe, ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ,+ n’ụlọ Jehonatan bụ́ odeakwụkwọ, ebe e jizi mere ụlọ mkpọrọ. 16 A tụbara Jeremaya n’otu n’ime ọnụ ụlọ ndị dị n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ala. Ọ nọtekwara aka ebe ahụ.
17 Eze Zedekaya mechara zie ozi, a kpọtara ya Jeremaya, ya ajụọ ya ajụjụ n’ụlọ* ya na nzuzo.+ Ọ jụrụ ya, sị: “Ò nwere ihe Jehova kwuru?” Jeremaya asị ya: “O nwere. A ga-enyefe gị n’aka eze Babịlọn.”+
18 Jeremaya gwakwara Eze Zedekaya, sị: “Olee ihe ọjọọ m mere gị na ndị na-ejere gị ozi na ndị obodo a, nke mere unu ji tụba m n’ụlọ mkpọrọ? 19 Oleezi ebe ndị amụma unu nọ, ndị buuru unu amụma, sị, ‘Eze Babịlọn agaghị alụso unu na ndị obodo a agha’?+ 20 Ugbu a, onyenwe m eze, biko, gee ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m na-arịọ. Akpọghachila m n’ụlọ Jehonatan+ bụ́ odeakwụkwọ, ka m ghara ịnwụ ebe ahụ.”+ 21 N’ihi ya, Eze Zedekaya kwuziri ka a tụba Jeremaya n’ụlọ mkpọrọ dị n’Ogige Ndị Nche.+ A na-esikwa n’okporo ámá ndị na-eme achịcha+ ewetara ya otu ogbe achịcha kwa ụbọchị, ruo mgbe achịcha gwụrụ n’obodo ahụ.+ Jeremaya nọgidekwara n’Ogige Ndị Nche ahụ.