42 A sị na Chineke nke nna m,+ bụ́ Chineke Ebreham nakwa Onye Aịzik na-atụ egwu ya,+ anọnyereghị m, ị gaara agbawa m aka sị m lawa. Chineke ahụwo nhụjuanya m na ndọgbu aka m dọgbuworo onwe ya n’ọrụ, o wee baara gị mba n’abalị ụnyaahụ.”+
12 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na Idọm abọwo ọbọ n’ahụ́ ụlọ Juda, ha wee na-eme ha ihe ọjọọ nke ukwuu ma bọọrọ onwe ha ọbọ n’ahụ́ ha,+