34 Unu ga-asị, ‘Ndị ohu gị anọwo na-akpa anụ malite n’oge anyị bụ ụmụaka ruo ugbu a, ma anyị onwe anyị ma nna nna anyị hà,’+ ka unu wee biri n’ala Goshen,+ n’ihi na onye ọ bụla na-azụ atụrụ bụụrụ Ijipt ihe arụ.+
47Josef wee bịa kọọrọ Fero, sị:+ “Nna m na ụmụnne m na ìgwè ewu na atụrụ ha na ìgwè ehi ha nakwa ihe niile ha nwere esiwo n’ala Kenan bịa, lee, ha nọ n’ala Goshen.”+