8 N’ikpeazụ, Juda gwara Izrel nna ya, sị: “Kpọnye m nwa okoro ahụ,+ ka anyị bilie gawa, ka anyị wee dịrị ndụ ghara ịnwụ,+ ma anyị ma gị onwe gị ma ụmụntakịrị anyị.+
18 Juda wee bịaruo ya nso wee sị: “Nna m ukwu, m na-arịọ gị arịrịọ, biko, ka ohu gị kwuo okwu ná ntị nna m ukwu,+ ka ị gharakwa iweso ohu gị iwe dị ọkụ,+ n’ihi na gị na Fero bụ otu ihe.+