11 Ndị niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá na ndị okenye wee sị: “Anyị bụ ndị akaebe! Ka Jehova mee ka nwunye gị nke na-abata n’ụlọ gị dịrị ka Rechel+ na Lia,+ bụ́ ndị wuru ụlọ Izrel;+ gosipụtakwa àgwà ọma gị n’Efrata+ ma mee ka aha gị dee ude na Betlehem.+
2 “Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata,+ obodo kachasị nta n’obodo ndị dị na Juda,+ ọ bụ n’ime gị+ ka onye ga-aghọ onye ọchịchị n’Izrel ga-esi pụta wee bịakwute m,+ onye malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.+