10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
6 N’ihi na a mụworo anyị otu nwa,+ e nyewokwa anyị otu nwa nwoke;+ ịchịisi ga-adị n’ubu ya.+ A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chineke nke bụ́ Dike,+ Nna Mgbe Ebighị Ebi,+ Onyeisi Udo.+
6 ‘Ma gị onwe gị, Betlehem+ nke dị n’ala Juda, ị bụghị ma ọlị obodo kasị nta n’etiti ndị na-achị Juda; n’ihi na n’ime gị ka onye na-achị achị ga-esi pụta,+ onye ga-azụ ndị m, bụ́ Izrel, dị ka atụrụ.’”+