12 Obodo ndị ahụ ga-abụrụ unu ebe mgbaba iji gbanahụ onye ọbọ ọbara,+ ka onye gburu mmadụ ghara ịnwụ ruo mgbe o guzoro n’ihu nzukọ unu ka e kpee ya ikpe.+
30 “‘Onye ọ bụla nke gburu mkpụrụ obi, a ga-egbu ya dị ka onye gburu ọchụ+ n’ọnụ ndị akaebe,+ otu onye akaebe agaghị enwe ike ịgbagide mkpụrụ obi akaebe ka e wee gbuo ya.
6 Ma ọ́ bụghị ya, ebe ọ bụ na obi dị onye ọbọ+ ọbara ọkụ, o nwere ike ịchụwa onye ahụ gburu mmadụ ma chụkwute ya, ebe ọ bụ na ụzọ dị anya; o nwekwara ike igbu mkpụrụ obi ya, ọ bụ ezie na ikpe ọnwụ amaghị ya,+ n’ihi na ọ kpọbughị ya asị.
11 ma ya fọdụzie mgbe ndị ajọ omume+ gburu onye ezi omume n’ụlọ ya, n’elu ihe ndina ya! Ugbu a, ọ̀ bụ na mụ agaghị ajụta ọbara ya n’aka unu,+ ọ̀ bụ na mụ agaghịkwa ekpochapụ unu n’ụwa?”+
30 Mgbe ahụ, ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ+ ga-apụta n’eluigwe, mgbe ahụkwa, ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị,+ ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu.+
8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị rụrụ arụ n’ihi omume ha ruru unyi+ na ndị na-egbu ọchụ+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị+ na ndị ụgha niile,+ òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ+ na sọlfọ+ na-enwu. Nke a pụtara ọnwụ nke abụọ.”+