Jenesis 15:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ma m ga-ekpe mba ha ga-agbara ohu ikpe,+ e mesịakwa, ha ga-eburu ọtụtụ akụ̀ pụọ.+ 2 Ndị Eze 13:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Otú ọ dị, Jehova meere ha amara,+ meekwara ha ebere+ ma chee ihu n’ebe ha nọ n’ihi ọgbụgba ndụ+ nke ya na Ebreham+ na Aịzik+ na Jekọb;+ ọ chọghịkwa ibibi ha,+ ọ chụpụghịkwa ha n’ihu ya ruo ugbu a. Abụ Ọma 105:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 O chetawo ọgbụgba ndụ ya ọbụna ruo mgbe a na-akaghị aka,+O chetawokwa ihe o nyere n’iwu, ruo otu puku ọgbọ,+
23 Otú ọ dị, Jehova meere ha amara,+ meekwara ha ebere+ ma chee ihu n’ebe ha nọ n’ihi ọgbụgba ndụ+ nke ya na Ebreham+ na Aịzik+ na Jekọb;+ ọ chọghịkwa ibibi ha,+ ọ chụpụghịkwa ha n’ihu ya ruo ugbu a.
8 O chetawo ọgbụgba ndụ ya ọbụna ruo mgbe a na-akaghị aka,+O chetawokwa ihe o nyere n’iwu, ruo otu puku ọgbọ,+