22 E mesịa, Mozis mere ka Izrel si n’Oké Osimiri Uhie pụọ, ha wee banye n’ala ịkpa Shọọ+ ma gaa ije n’ala ịkpa ahụ ruo ụbọchị atọ, ma ha ahụghị mmiri.+
3 Ụmụ Izrel wee na-agwa ha, sị: “A sị nnọọ na Jehova ji aka ya gbuo+ anyị n’ala Ijipt mgbe anyị nọ ọdụ n’akụkụ ite anụ,+ mgbe anyị nọ na-eriju ihe oriri afọ, n’ihi na unu akpọpụtawo anyị wee kpọta anyị n’ala ịkpa a ka ụnwụ gbuo ọgbakọ a dum.”+
14 E mesịa, Mozis si na Kedesh zigara eze Idọm ndị ozi,+ sị: “Nke a bụ ihe nwanne gị bụ́ Izrel+ kwuru, ‘Gị onwe gị maara nke ọma ihe isi ike bịakwasịrị anyị.+