7 Na-atụnụ+ egwu Jehova.+ Kpacharanụ anya n’ihe unu na-eme,+ n’ihi na ajọ omume+ ma ọ bụ ile mmadụ anya n’ihu+ ma ọ bụ iri ngarị+ adịghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ.”
12 N’ihi na amaara m ugboro ole unu nupụrụ isi+ nakwa otú mmehie unu jọruru ná njọ,+ unu ndị na-ebuso onye ezi omume iro,+ unu ndị na-anara ego aka azụ,+ ndị kwapụwokwara ụmụ ogbenye n’akụkụ+ ọbụna n’ọnụ ụzọ ámá.+