14 Jehova wee weso Izrel iwe dị ọkụ,+ o wee nyefee ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe,+ ha wee na-akwakọrọ ihe ha; o wee were ha resị ndị iro ha gbara ha gburugburu,+ ha enweghịkwa ike iguzo n’ihu ndị iro ha.+
10 Ndị Filistia wee buo agha, e wee merie Izrel,+ onye ọ bụla n’ime ha wee gbaa ọsọ gbaga n’ụlọikwuu ya;+ ndị e gburu wee dị nnọọ ukwuu,+ nke mere na n’etiti ndị Izrel, puku ndị ikom iri atọ ndị ji ụkwụ aga nwụrụ.+