8 “N’oge ahụ, Jehova kewapụrụ ebo Livaị+ iche maka ibu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ ka ha na-eguzo n’ihu Jehova maka ijere ya ozi+ na iji aha ya na-enye ngọzi ruo taa.+
5 “Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị ga-abịarukwa nso, n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova bụ́ Chineke gị họọrọ ka ha na-ejere ya ozi+ nakwa ka ha jiri aha Jehova na-agọzi ndị mmadụ,+ ọ bụkwa ọnụ ha ga-ekpe ikpe esemokwu ọ bụla metụtara ime ihe ike ọ bụla.+
13 Ụmụ Amram bụ Erọn+ na Mozis.+ Ma e doro Erọn iche+ ka o wee na-edo Ebe Kasị Nsọ nsọ,+ ya na ụmụ ya ndị ikom, ruo mgbe a na-akaghị aka, isure ihe nsure+ ọkụ n’ihu Jehova, ijere ya ozi+ na iji aha ya na-agọzi+ ndị mmadụ ruo mgbe a na-akaghị aka.