8 “Kpachara anya maka ihe otiti ekpenta+ ka i wee lezie anya nke ọma mee ihe niile ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ga-agwa gị.+ Dị nnọọ ka m nyere ha n’iwu, otú ahụ ka unu ga-elezi anya+ mee.
8 Ha wee jiri olu dara ụda na-agụpụta+ ihe dị n’akwụkwọ ahụ, ihe dị n’iwu ezi Chineke, na-akọwa ya, na-emekwa ka o doo anya; ha nọkwa na-eme ka a ghọta ihe a na-agụpụta.+
18 Ha wee sị: “Bịanụ ka anyị chepụta ihe anyị ga-eme Jeremaya,+ n’ihi na iwu agaghị akọ ụkọ n’ọnụ ndị nchụàjà,+ ndụmọdụ agaghị akọ ụkọ n’ọnụ onye maara ihe, okwu agaghịkwa akọ ụkọ n’ọnụ onye amụma.+ Bịanụ ka anyị were ire anyị mee ya ihe,+ ka anyị gharakwa ịṅa ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.”
7 N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ichekwa ihe ọmụma, ndị mmadụ kwesịkwara ịchọ iwu n’ọnụ ya;+ n’ihi na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.+