26 Ha wee gakwuru Mozis na Erọn na nzukọ ụmụ Izrel dum n’ala ịkpa Peran, na Kedesh.+ Ha wee kọọrọ ha na nzukọ ahụ dum otú ha si jee, gosikwa ha mkpụrụ nke ala ahụ.
14 Oge anyị jere ije malite na Kedesh-bania ruo mgbe anyị gafere iyi ndagwurugwu Zired dị afọ iri atọ na asatọ, ruo mgbe ọgbọ ahụ dum bụ́ ndị ikom na-aga agha nwụchara n’etiti ndị Izrel, dị nnọọ ka Jehova ṅụụrụ ha iyi.+