33 Mozis wee nye ụmụ Gad+ na ụmụ Ruben+ na ọkara ebo Manase+ nwa Josef ala nke Saịhọn+ bụ́ eze Amọraịt chịrị na ala nke Ọg+ bụ́ eze Beshan chịrị, ya bụ, ala nke obodo ndị dị n’ókèala ha, tinyere obodo ndị gbara ala ahụ gburugburu.
12 Anyị wee weghara ala a n’oge ahụ; enyewo m ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ ala malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn, na ọkara ógbè Gilied nke bụ́ ugwu ugwu nakwa obodo ya dị iche iche.
13 Enyewokwa m ọkara ebo Manase ebe fọdụrụ na Gilied+ nakwa Beshan+ dum nke dị n’alaeze Ọg. Ógbè Agọb+ dum nke dị na Beshan dum, ọ̀ bụ na a dịghị akpọ ya ala ndị Refeyim?+
8 Ụmụ Ruben na ụmụ Gad so ọkara ebo nke ọzọ nweta ihe nketa ha nke Mozis nyere ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan, dị nnọọ ka Mozis ohu Jehova nyere ha,+