14Nke a bụ ala ụmụ Izrel nwetara dị ka ihe nketa n’ala Kenan,+ nke Elieza onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ebo dị iche iche nke ụmụ Izrel mere ka ha keta.+
51 Ọ bụ ndị a bụ ihe nketa Elieza onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn na ndị isi nke ndị bụ́ nna n’ebo dị iche iche nke ụmụ Izrel kesara+ dị ka ihe onwunwe site n’ife nza na Shaịlo+ n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ Ha wee kwụsị ike ala ahụ.