19 Ma nna ya jụrụ ajụ wee sị: “Ama m, nwa m, ama m. Ya onwe ya kwa ga-aghọ ìgwè mmadụ, ya onwe ya kwa ga-adị ukwuu.+ Ka o sina dị, nwanne ya nke nta ga-aka ya ukwuu,+ ụmụ ya ga-aha nnọọ ka ọtụtụ mba.”+
6 ha asị ya: “Biko, kpọgodị Shibolet.”+ Onye ahụ asị: “Sibolet,” n’ihi na ọ gaghị akpọtali okwu ahụ. Ha na-ejide ya ma gbuo ya n’ebe ndị a na-eji ụkwụ agafe osimiri Jọdan. Ndị nwụrụ mgbe ahụ n’ime ndị Ifrem wee bụrụ puku mmadụ iri anọ na abụọ.+