22 M ga-apụta ìhè n’ihu gị n’ebe ahụ wee si n’elu ihe mkpuchi ahụ gwa gị okwu,+ n’agbata cherọb abụọ ahụ dị n’elu igbe ihe àmà ahụ, bụ́ ihe niile m ga-enye gị n’iwu maka ụmụ Izrel.+
18 M ga-esi n’etiti ụmụnne ha họpụtara ha onye amụma nke dị ka gị onwe gị;+ m ga-etinyekwa okwu m n’ọnụ ya,+ ọ ga-agwakwa ha ihe niile m ga-enye ya n’iwu.+
30 Apụghị m ime otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka m; dị nnọọ ka m si anụ, otú ahụ ka m si ekpe ikpe; ihe m na-ekpe n’ikpe zikwara ezi,+ n’ihi na ihe m na-achọ ime abụghị uche nke m, kama ọ bụ uche+ onye zitere m.