7 “Naanị nwee obi ike, dịkwa ike nke ukwuu ka i wee lezie anya mezuo iwu ahụ dum nke Mozis ohu m nyere gị.+ Ahapụla ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ ka i wee jiri amamihe mee ihe n’ebe ọ bụla ị na-aga.+
18 “Ana m agbara onye ọ bụla nke na-anụ okwu amụma nke dị n’akwụkwọ mpịakọta a àmà, sị: Ọ bụrụ na onye ọ bụla atụkwasị ihe+ n’ihe ndị a, Chineke ga-atụkwasịrị ya ihe otiti+ ndị e dere n’akwụkwọ mpịakọta a;