4 N’ihi na, dị ka o si dị, ọ bụrụ na mmadụ abịa na-ekwusa Jizọs nke dị iche na nke ahụ anyị kwusara,+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na unu anata mmụọ dị iche na nke unu nataworo,+ ma ọ bụ, ozi ọma+ dị iche na nke unu nabatara, unu na-anabata onye ahụ ngwa ngwa.+
8 Otú ọ dị, ọ bụrụgodị na anyị ma ọ bụ mmụọ ozi nke si n’eluigwe ezisaara unu ozi ọma karịrị ihe anyị zisaara unu n’ozi ọma, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.+
3 ma okwu ọ bụla nke si n’aka mmụọ, nke na-adịghị ekwupụta Jizọs, esighị n’aka Chineke.+ Ọ bụ ya bụ okwu si n’aka mmụọ nke onye ahụ na-emegide Kraịst, onye unu nụrụ na ọ na-abịa,+ ugbu a, ọ nọrọlarị n’ụwa.+