17 Njehie anyị jehiere na Piọ+ ọ̀ bụụrụ anyị ihe nta, bụ́ nke anyị na-asachapụbeghị n’ahụ́ anyị ruo taa, ọ bụ ezie na ihe otiti ahụ dakwasịrị nzukọ Jehova?+
10 “Ahụrụ m Izrel dị ka mkpụrụ vaịn dị n’ala ịkpa.+ Ahụrụ m ndị nna nna unu dị ka mkpụrụ mbụ osisi fig mịrị na nke mbụ ya.+ Ha bakwuuru Bel nke Piọ,+ ha wee rara onwe ha nye ihe ihere,+ ha wee ghọọ ndị rụrụ arụ dị nnọọ ka ihe ahụ nke ha hụrụ n’anya.+
7 Unu abụkwala ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’ime ha mere;+ dị nnọọ ka e dere, sị: “Ndị Izrel nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ha wee bilie ikpori ndụ.”+