14 Ndị ikom ahụ wee sị ya: “Mkpụrụ obi anyị ga-anwụ kama unu onwe unu ịnwụ!+ Ọ bụrụ na unu akọghị banyere ihe a anyị bịara, ọ ga-erukwa na mgbe Jehova ga-enye anyị ala a, anyị ga-egosi gị obiọma na ikwesi ntụkwasị obi.”+
17 Obodo a ga-abụkwa ihe a ga-ebibi ebibi;+ ya na ihe niile dị n’ime ya bụ nke Jehova. Naanị Rehab+ nwaanyị akwụna ahụ ga-adị ndụ, ya na ndị niile ya na ha nọ n’ụlọ, n’ihi na o zoro ndị ozi ahụ anyị zipụrụ.+
22 Jọshụa wee gwa ndị ikom abụọ ahụ gara ledo ala ahụ, sị: “Banyenụ n’ụlọ nwaanyị ahụ, bụ́ nwaanyị akwụna, kpọpụta nwaanyị ahụ na ndị niile bụ́ nke ya n’ebe ahụ, dị nnọọ ka unu ṅụụrụ ya iyi.”+