15 Jọshụa wee sị ha: “Ọ bụrụ na unu dị ọtụtụ, gbagoonụ n’oké ọhịa, jirikwanụ aka unu sụọ ebe ahụ, n’ala ndị Perizaịt+ na ndị Refeyim,+ ebe ọ bụ na ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu+ abaghị unu.”
16 Ụmụ Josef wee sị: “Ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu agaghị ezuru anyị, ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ala ahụ nke dị na ndagwurugwu, nwere ụgbọ ịnyịnya agha+ ndị nwere mma, tinyere ndị bi na Bet-shian+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na ndagwurugwu Jezril.”+