Joshụa 8:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 O wee ruo na ngwa ngwa eze E-aị hụrụ ya, ya na ndị ya niile, bụ́ ndị ikom obodo ya, mere ọsọ ọsọ bilie n’isi ụtụtụ gaa ibuso Izrel agha, n’oge a kara aka, n’ihu mbara ọzara. Ma ọ maghị na e nwere ndị zoro n’azụ obodo ahụ.+ Ndị Ikpe 20:41 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 41 Ndị Izrel wee tụgharịa,+ ma ndị Benjamin mara jijiji,+ n’ihi na ha hụrụ na ọdachi adakwasịwo ha.+ Ilu 4:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Ụzọ ndị ajọ omume yiri ọchịchịrị;+ ha amaghịkwa ihe na-akpọbi ha ụkwụ.+ Ilu 28:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Obi ụtọ na-adịrị onye ụjọ na-atụ mgbe niile,+ ma onye na-akpọchi obi ya ga-adaba n’oké nsogbu.+ Ilu 29:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 Onye a na-adọ aka ná ntị ugboro ugboro+ ma ya ana-ekwesi olu ike,+ a ga-agbaji ya na mberede, ngwọta agaghịkwa adị.+
14 O wee ruo na ngwa ngwa eze E-aị hụrụ ya, ya na ndị ya niile, bụ́ ndị ikom obodo ya, mere ọsọ ọsọ bilie n’isi ụtụtụ gaa ibuso Izrel agha, n’oge a kara aka, n’ihu mbara ọzara. Ma ọ maghị na e nwere ndị zoro n’azụ obodo ahụ.+
29 Onye a na-adọ aka ná ntị ugboro ugboro+ ma ya ana-ekwesi olu ike,+ a ga-agbaji ya na mberede, ngwọta agaghịkwa adị.+