20 E wee kpọpụta Sọl na ndị niile ya na ha so.+ Ha wee bịarute n’ọgbọ agha ahụ, ma, lee, mma agha onye nke ọ bụla gburu mmadụ ibe ya;+ ọgba aghara ahụ dị nnọọ ukwuu.
23 Ụmụ Amọn na Moab wee buso ndị bi n’ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu+ agha wee bibie ha ma laa ha n’iyi; ozugbo ha lasịrị ndị bi na Sia n’iyi, ha gburịtara onwe ha.+
2 “M ga-akpali ndị Ijipt ka ha buso ndị Ijipt agha. Onye ọ bụla ga-ebuso nwanne ya agha. Onye ọ bụla ga-ebuso enyi ya agha, obodo ga-ebuso obodo agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze agha.+
21 “‘M ga-emekwa ka mma agha bịakwasị ya n’ógbè m niile bụ́ ugwu ugwu,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Mma agha onye nke ọ bụla ga-abịakwasị nwanne ya.+
13 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ọgba aghara nke si n’aka Jehova ga-adị ebe niile n’etiti ha;+ ha ga-ejidekwa ibe ha, onye ọ bụla ga-ejide aka ibe ya, ha ga-emegidekwa ibe ha.