6 Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya,+ o wee dọwaa ya abụọ, dị nnọọ ka mmadụ si adọwa nwa mkpi, o jighịkwa ihe ọ bụla n’aka. Ọ gwaghịkwa nna ya na nne ya ihe o mere.
14 Ya onwe ya wee bịarute Lihaị, ndị Filistia wee tie mkpu ọṅụ mgbe ha hụrụ ya.+ Mmụọ Jehova+ wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya, ụdọ ndị ahụ e kere ya n’aka wee dị ka eriri ákwà linin a ṅara n’ọkụ,+ agbụ e kere ya n’aka wee gbazee.