9 Ndị chebiiri ya nọkwa ọdụ n’ime ime ụlọ ya,+ o wee sị ya: “Samsịn, ndị Filistia+ abịala ime gị ihe!” O wee dọbisịa akwara ahụ, dị nnọọ ka owu si adọbi ma a ṅaa ya n’ọkụ.+ A mataghịkwa ebe ike ya dị.+
12 Delaịla wee chịrị ụdọ ọhụrụ kee ya, sị ya: “Samsịn, ndị Filistia abịala ime gị ihe!” N’ime oge a, ndị ahụ chebiiri ya nọ ọdụ n’ime ime ụlọ.+ O wee dọbie ụdọ ahụ e kere ya n’aka dị ka à ga-asị na ọ bụ eriri.+
14 O wee were osisi e ji ekwe ákwà jikọta ùkwù ntutu isi ya, sị ya: “Samsịn, ndị Filistia abịala ime gị ihe!”+ O wee si n’ụra teta, fopụ osisi ahụ, dọbiekwa owu ahụ e ji akpa ákwà.