27Otú ọ dị, Devid kwuru n’obi ya, sị: “Otu ụbọchị aka Sọl ga-ala m n’iyi. Ọ dịghị ihe kara m mma ma ọ bụghị ịgbaga+ n’ala ndị Filistia;+ ike ga-agwụkwa Sọl ịchọ m n’ókèala dum nke Izrel,+ m ga-agbapụkwa n’aka ya.”
9 N’eziokwu, anyị chere n’ime onwe anyị na a mawo anyị ikpe ọnwụ. Ihe mere anyị ji chee otú a bụ ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi,+ kama ka anyị tụkwasị Chineke obi, bụ́ onye na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.+