14 Boaz wee gwa ya n’oge ha na-eri nri, sị: “Bịa ebe a, were achịcha rie,+ surukwa achịcha gị n’ime mmanya.” O wee nọdụ ọdụ n’akụkụ ndị ahụ na-ewe ihe ubi, ya ana-enye ya ọka a ṅara n’ọkụ,+ o wee na-ata, o wee rijuo afọ, rifọkwa.
17 Jesi wee sị Devid nwa ya: “Biko, buru ọka* a a ṅara n’ọkụ+ nke dị otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa na ogbe achịcha iri a bugara ụmụnne gị, buru ha ngwa ngwa bugara ụmụnne gị n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.