25 Jehova ga-eme ka e merie gị n’ihu ndị iro gị.+ Otu ụzọ ka ị ga-esi gaa ibuso ha agha, ma ị ga-esi n’ụzọ asaa gbaa ọsọ n’ihu ha; ị ga-aghọkwa ihe ga-eme ka alaeze niile nke ụwa tụọ ụjọ.+
14 Jehova wee weso Izrel iwe dị ọkụ,+ o wee nyefee ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe,+ ha wee na-akwakọrọ ihe ha; o wee were ha resị ndị iro ha gbara ha gburugburu,+ ha enweghịkwa ike iguzo n’ihu ndị iro ha.+