11 E mesịa, Sọl zipụrụ ndị ozi+ ka ha chee ụlọ Devid nche, ka ha gbuokwa ya n’ụtụtụ;+ ma Maịkal nwunye Devid gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na i kweghị ka mkpụrụ obi gị gbapụ n’abalị a, echi ị ga-abụ onye e gburu egbu.”
13 O wee sị: “Ọ dị mma! Mụ na gị ga-agba ndụ. Naanị otu ihe ka m na-achọ n’aka gị: ‘Ị gaghị ahụ ihu m+ ọ gwụkwala ma ì bu ụzọ kpọta Maịkal,+ ada Sọl, mgbe ị ga-abịa ịhụ ihu m.’”
16 O wee ruo na mgbe e bubatara igbe Jehova n’Obodo Devid, Maịkal,+ nwa Sọl, si na windo leda anya wee hụ Eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etegharị egwú n’ihu Jehova; o wee leda ya anya+ n’obi ya.+
29 O wee ruo na mgbe igbe ọgbụgba ndụ+ Jehova rutere n’Obodo Devid, Maịkal+ nwa Sọl si na windo leda anya wee hụ Eze Devid ka ọ na-awụligharị elu na-enwe aṅụrị;+ o wee leda ya anya+ n’obi ya.