Levitikọs 19:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 “‘Agagharịla n’etiti ụmụnna gị iji kwutọọ mmadụ.+ Ebilila ịwụfu ọbara mmadụ ibe gị.+ Abụ m Jehova. 2 Samuel 16:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Eze wee jụọ, sị: “Olee ebe nwa nna gị ukwu nọ?”+ Zaịba wee zaa eze, sị: “Ọ nọ na Jeruselem; n’ihi na ọ sịrị, ‘Taa, ụlọ Izrel ga-enyeghachi m ọchịchị nna m.’”+ Abụ Ọma 101:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Onye ọ bụla nke na-ekwutọ ibe ya na nzuzo,+M ga-emechi ya ọnụ.+Onye ọ bụla anya ya dị mpako, onye obi ya dịkwa nganga,+Agaghị m edili ihe ọ na-eme.+ Ilu 6:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 onye akaebe ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume,+ na onye ọ bụla nke na-ezisa esemokwu n’etiti ụmụnne.+ Ilu 21:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Iji ire aghụghọ enweta akụ̀ bụ ume e kupụrụ ekupụ;+ ndị na-eme otú ahụ na-achọ ọnwụ.+
16 “‘Agagharịla n’etiti ụmụnna gị iji kwutọọ mmadụ.+ Ebilila ịwụfu ọbara mmadụ ibe gị.+ Abụ m Jehova.
3 Eze wee jụọ, sị: “Olee ebe nwa nna gị ukwu nọ?”+ Zaịba wee zaa eze, sị: “Ọ nọ na Jeruselem; n’ihi na ọ sịrị, ‘Taa, ụlọ Izrel ga-enyeghachi m ọchịchị nna m.’”+
5 Onye ọ bụla nke na-ekwutọ ibe ya na nzuzo,+M ga-emechi ya ọnụ.+Onye ọ bụla anya ya dị mpako, onye obi ya dịkwa nganga,+Agaghị m edili ihe ọ na-eme.+
19 onye akaebe ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume,+ na onye ọ bụla nke na-ezisa esemokwu n’etiti ụmụnne.+