22 E mesịa, onye amụma+ ahụ bịakwutere eze Izrel wee sị ya: “Lawa, mee onwe gị ka ị dị ike,+ tụlee ihe a ma mara ihe ị gaje ime;+ n’ihi na ná mmalite afọ, eze Siria ga-agbagote ibuso gị agha.”+
10 O wee ruo ná mmalite+ afọ na Eze Nebukadneza zipụrụ+ ndị ikom ya ka ha kpụta ya Babịlọn+ ma bute arịa ndị mara mma dị n’ụlọ Jehova.+ O mekwara Zedekaya+ nwanne nna ya eze Juda nakwa Jeruselem.+