45 Ma ndị Izrel sịrị Sọl: “Jọnatan ọ̀ ga-anwụ, bụ́ onye mere ka e nwee nzọpụta a dị ukwuu+ n’Izrel? Tụfịakwa!+ Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ otu ntutu isi+ ya agaghị ada n’ala; n’ihi na ya na Chineke rụrụ ọrụ taa.”+ Ndị Izrel wee si otú a napụta+ Jọnatan, ọ nwụghịkwa.