22 Ma Devid sịrị: “Unu ụmụ Zeruya, gịnị jikọrọ mụ na unu,+ mere unu ga-eji na-eguzogide m taa?+ È kwesịrị igbu onye ọ bụla taa n’Izrel?+ Ọ̀ bụ na mụ amaghị nke ọma na abụ m eze Izrel taa?”
13 Ịlaịsha wee sị eze Izrel: “Gịnị jikọrọ mụ na gị?+ Gakwuru ndị amụma+ nna gị na ndị amụma nne gị.” Ma eze Izrel sịrị ya: “Ee e, n’ihi na Jehova akpọwo ndị eze atọ a ka o nyefee ha n’aka Moab.”+