1 Samuel 17:50 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 50 Devid wee jiri èbè na nkume merie onye Filistia ahụ, o wee gbatuo onye Filistia ahụ, gbuo ya; ọ dịghịkwa mma agha ọ bụla Devid ji.+ 1 Samuel 18:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ndị inyom ahụ bụ́ ndị na-enwe aṅụrị nọ na-agụ egwú, sị:“Sọl egbuwo puku kwuru puku,Devid egbuwokwa iri puku kwuru iri puku.”+ 1 Samuel 19:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 O tinyere mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ+ wee gbuo onye Filistia ahụ,+ Jehova wee zọpụta+ Izrel dum n’ụzọ dị ukwuu. Ị hụrụ ya, ị ṅụrịkwara ọṅụ. Gịnị mere ị ga-eji mehie megide ọbara na-emeghị ihe ọjọọ site n’igbu+ Devid n’enweghị ihe o mere?”+ 2 Samuel 5:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 Devid wee mee otú ahụ, dị nnọọ ka Jehova nyere ya n’iwu,+ o wee gbuo+ ndị Filistia malite na Giba+ ruo Giza.+ 2 Samuel 8:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Mgbe Siria nke Damaskọs+ bịara inyere Hadadiza eze Zoba aka, Devid gburu puku ndị ikom iri abụọ na abụọ n’ime ndị Siria.+
50 Devid wee jiri èbè na nkume merie onye Filistia ahụ, o wee gbatuo onye Filistia ahụ, gbuo ya; ọ dịghịkwa mma agha ọ bụla Devid ji.+
7 Ndị inyom ahụ bụ́ ndị na-enwe aṅụrị nọ na-agụ egwú, sị:“Sọl egbuwo puku kwuru puku,Devid egbuwokwa iri puku kwuru iri puku.”+
5 O tinyere mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ+ wee gbuo onye Filistia ahụ,+ Jehova wee zọpụta+ Izrel dum n’ụzọ dị ukwuu. Ị hụrụ ya, ị ṅụrịkwara ọṅụ. Gịnị mere ị ga-eji mehie megide ọbara na-emeghị ihe ọjọọ site n’igbu+ Devid n’enweghị ihe o mere?”+
25 Devid wee mee otú ahụ, dị nnọọ ka Jehova nyere ya n’iwu,+ o wee gbuo+ ndị Filistia malite na Giba+ ruo Giza.+
5 Mgbe Siria nke Damaskọs+ bịara inyere Hadadiza eze Zoba aka, Devid gburu puku ndị ikom iri abụọ na abụọ n’ime ndị Siria.+