11 O wee sị: “Nke a ga-abụ ihe ruuru+ eze ga na-achị unu: Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị ikom+ wee mee ka ha bụrụ ndị na-anọkwasịrị ya n’ụgbọ ịnyịnya,+ meekwa ka ha soro ná ndị na-agba ịnyịnya ya,+ ụfọdụ ga na-agbakwa ọsọ n’ihu ụgbọ ịnyịnya ya;+
7 Sọlọmọn nwere ndị nnọchiteanya iri na abụọ n’Izrel dum, ha na-ewetakwara eze na ezinụlọ ya nri. Ọ bụ ọrụ dịịrị onye nke ọ bụla iweta nri otu ọnwa n’afọ.+