7 n’ihi njehie ha na njehie ndị nna nna ha n’otu mgbe ahụ,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na ha esurewo ihe nsure ọkụ n’elu ugwu ukwu, ha akọchawokwa m+ n’elu ugwu nta,+ m ga-ebu ụzọ tụọ ụgwọ ọrụ ha atụ̀ ma wụnye ya n’obi uwe ha.”+
20 “‘N’ihi na m kụrisịrị yok gị mgbe dị anya gara aga;+ m dọbisịrị agbụ e kere gị. Ma ị sịrị: “Agaghị m ejere gị ozi,” n’ihi na ọ bụ n’ugwu ọ bụla dị elu nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ+ ka ị na-edina jaghee ụkwụ+ gị wee na-agba akwụna.+
13 Ha na-achụ àjà n’elu ugwu ukwu,+ ha na-esurekwa ihe nsure ọkụ n’elu ugwu nta dị iche iche,+ n’okpuru oké osisi na osisi stọraks na osisi ukwu, n’ihi na ndò ya dị mma.+ Ọ bụ ya mere ụmụ unu ndị inyom na ndị nwunye ụmụ unu ji na-akwa iko.