20Ma Ben-hedad+ eze Siria chịkọtara ndị agha ya niile, ndị eze iri atọ na abụọ sokwa ya,+ tinyere ịnyịnya+ na ụgbọ ịnyịnya,+ o wee gbagoo nọchibido+ Sameria,+ buso ya agha.
24 E mesịa, eze Asiria si na Babịlọn+ na Kuta na Ava+ na Hemat+ na Sefaveyim+ kpọta ndị mmadụ, meekwa ka ha bichie ụmụ Izrel n’obodo ndị dị na Sameria;+ ha wee malite iweghara Sameria, birikwa n’obodo ya dị iche iche.
6“Ahụhụ ga-adịrị ndị tụsaara ahụ́+ na Zayọn na ndị tụkwasịrị ugwu Sameria obi! Ha bụ ndị a na-akwanyere ùgwù n’ime mba bụ́ isi n’etiti mba niile, ụlọ Izrel abịakwutewokwa ha.