3 Ụmụ ndị amụma+ ndị nọ na Betel pụtara bịakwute Ịlaịsha wee sị ya: “Ị̀ makwa na ọ bụ taa ka Jehova ga-ewepụ nna gị ukwu ka ọ ghara ịbụkwa onyeisi gị?”+ O wee zaa, sị: “Mụ onwe m kwa maara nke ọma.+ Gbanụ nkịtị.”
11 Jehọshafat wee sị:+ “Ọ̀ bụ na e nweghị onye amụma Jehova+ n’ebe a? Ka anyị jụọ Jehova ase site n’ọnụ ya.”+ Otu n’ime ndị na-ejere eze lzrel ozi wee zaa, sị: “E nwere Ịlaịsha+ nwa Shefat n’ebe a, bụ́ onye wụsara mmiri n’aka Ịlaịja.”+