20 “‘Otú ọ dị, onye amụma nke ji mpako were aha m kwuo ihe m na-enyeghị ya iwu ka o kwuo,+ ma ọ bụ nke kwuru okwu n’aha chi ọzọ,+ onye amụma ahụ ga-anwụ.+
16 Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Egela ntị n’ihe ndị amụma, bụ́ ndị na-eburu unu amụma, na-ekwu.+ Ha na-eme ka unu bụrụ ihe efu.+ Ọ bụ ọhụụ nke si n’obi ha ka ha na-ekwupụta+—ọ bụghị nke si n’ọnụ Jehova.+
17 Ugboro ugboro ka ha na-asị ndị na-adịghị asọpụrụ m, ‘Jehova sịrị: “Udo ga-adịrị unu.”’+ Ha na-agwakwa onye ọ bụla nke na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ya si dị,+ sị, ‘Ọ dịghị ọdachi ga-adakwasị unu.’+
6 “Ha ahụwo ihe na-abụghị eziokwu n’ọhụụ,+ afa ha gbakwara bụ ụgha, ha na-asị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru,’ mgbe ọ na-abụghị Jehova dunyere ha, ha echerewokwa ka ihe ha kwuru mezuo.+