10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
12 “Ọ bụrụ na i jee ije n’ụkpụrụ m,+ meekwa ihe ndị m kpere n’ikpe+ ma debe ihe niile m nyere n’iwu site n’ije ije na ha,+ mụ onwe m ga-eme ka okwu m gwara Devid nna gị mezuo n’ebe ị nọ,+ karịsịa, ihe m kwuru banyere ụlọ a ị na-ewu;
20 O wee ruo na ozugbo Izrel dum nụrụ na Jeroboam alọghachiwo, ngwa ngwa ahụ ha zigara ozi wee kpọọ ya ka ọ bịa nzukọ ha, ha wee mee ya eze Izrel dum.+ Ọ dịghị ebo ọ bụla sooro ụlọ Devid ma e wezụga naanị Juda.+