15Okwu e kwuru megide Moab:+ N’ihi na e bukọrọwo ihe ya n’abalị, a lawo Aa+ nke Moab n’iyi. N’ihi na e bukọrọwo ihe ya n’abalị, a lawo Kia+ nke Moab n’iyi.
7 Ya mere, ndị Moab ga-etiri Moab mkpu ákwá; ọbụna ha niile ga-eti mkpu ákwá.+ Ndị e tiri ihe ga-akwa ákwá maka mkpụrụ vaịn a mịrị amị nke Kia-hareset,+