21 Ebuuru m mmehie ahụ unu mere, ya bụ, nwa ehi+ ahụ, m wee kpọọ ya ọkụ ma gwerie ya, m gweriri ya nke ọma ruo mgbe ọ dị ka uzuzu; e mesịa, m wụnyere ntụ ya n’ime iyi nke si n’ugwu ahụ na-asọdata.+
29 N’ihi na m maara nke ọma na mgbe m nwụsịrị, unu ga-emerịrị omume na-eweta mbibi,+ unu ga-ahapụkwa ụzọ ahụ m nyere unu iwu ka unu soro; ọdachi+ ga-adakwasịkwa unu ná ngwụsị ụbọchị ndị ahụ, n’ihi na unu ga-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova iji kpasuo ya iwe site n’ihe aka unu ga-arụ.”+