40 Ha ga-ekwupụta njehie ha+ nakwa njehie ndị nna ha na ekwesịghị ntụkwasị obi ha n’ụzọ ha si meso m omume ekwesịghị ntụkwasị obi, ee, ọbụna n’ụzọ ha jere ije megide m.+
29 “Ị̀ hụwo otú Ehab si weda onwe ya ala n’ihi m?+ Ebe ọ bụ na o wedara onwe ya ala n’ihi m, agaghị m eweta ọdachi ahụ n’ụbọchị ya.+ Ọ bụ n’ụbọchị nwa ya ka m ga-eme ka ọdachi ahụ dakwasị ụlọ ya.”+
8 Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma.+ Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi+ na ịhụ obiọma+ n’anya nakwa iji obi umeala+ soro Chineke gị na-eje ije?+
6 Ma, obiọma na-erughịrị mmadụ nke ọ na-egosi ka ukwuu.+ N’ihi ya, o kwuru, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako,+ ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.”+