11 ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase+ ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.+
6 O surekwara* nwa ya n’ọkụ.+ O mekwara anwansi,+ chọọ ihe mgbaàmà ọdịnihu, kwekwa ka ndị na-agba afa+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu+ nọrọ. O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.
19 Ọ bụrụkwa na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ase+ ma ọ bụ ndị nwere mmụọ ịkọ ọdịnihu, bụ́ ndị na-ebe ubé,+ na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ọ́ bụghị Chi ha ka ndị ọ bụla kwesịrị ịjụ ase?+ È kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase maka ndị dị ndụ?+
16 O wee daba na ka anyị nọ na-eje n’ebe a na-ekpe ekpere, otu nwa agbọghọ na-eje ozi, onye nwere otu mmụọ,+ bụ́ mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase,+ zutere anyị. Ọ na-ewetara ndị nna ya ukwu uru dị ukwuu+ site n’ịkọ ọdịnihu.